Psalms 143

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara;
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị,
bịa nyere m aka.
2Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe,
nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.
3Onye iro na-achụ m ọsọ,
ọ na-azọpịa ndụ m nʼala;
na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị,
dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga.
4Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m
ụjọ jupụtakwara m nʼobi.
5Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga;
ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile
na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ.
6Ana m agbasa aka m abụọ nye gị;
agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela

7O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ;
mmụọ m na-ada mba.
Ezonarịla m ihu gị,
ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili.
8Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ,
nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.
Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso,
nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye.
9O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m,
nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m.
10Kuziere m ime uche gị,
nʼihi na ị bụ Chineke m;
ka ezi Mmụọ gị
duo m nʼala dị larịị.

11O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m;
nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu.
12Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m;
laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi,
nʼihi na abụ m ohu gị.
Copyright information for IboBIU